17 Ọktọba 2021

Stan Nze akọwaala ihe mere o ji lụọ nwunye ya bụ Blessing Jessica Obasi, n'agbanyeghị na ndị mmadụ na-ekwu na ọ dị afọ iri anọ na abụọ (42).
Agbamakwụkwọ Stan Nze na Jessica Obasi kporo ọkụ na soshal midia n'ọnwa Sepụtemba, n'ihi na onweghị onye ma na ha abụọ na-akwado ịlụ onwe ha.
Na mkparịtaụka ya na BBC Pidgin nwere, Stan Nze kwuru na ihe mere o ji lụọ nwunye ya bụ na ọ naghị awa ya isi.
'Anaghị m agwọ ọgwụ ọ bụ ihe na-eme n'obodo ka anyị na-egosi' - Kanayo O kanayo
Nwunye m na-enye m udo nke obi

Stan Nze kọwara na ya na ọtụtụ ụmụnwaanyị mara emekọọla ihe, mana ọ bụ Blessing Obasi ka obi ya nabatara.
"Ọtụtụ ndị mmadụ na-akọ m ọmụ na Soshal midia na-ekwu na m lụrụ nwaanyị tọrọ mụ atọ. Na mụ mara mma karịa ya. No o tosịghị m."
"Gịnị mere mụ ji lụọ nwaanyị dị afọ 42? Nke a, nke ọzọ."
"Mana ihe niile ndị ahụ agbasaghị m. A lụrụ m ezigbo enyi m."
"Alụrụ m onye nyere mụ udo, onye m ma na Chineke kwadoro maka m."
Stan Nze na-egosi iwe ya
Nze gara n'ihu kọwaa na otu ihe dọtara ya ebe nwunye ya nọ bụ na ọ bụghị onye ihu abụọ.
"O nweghị ihe mụ na ya na-ezoro onwe anyị ezoro. Anyị anaghị eme meremere n'ihu."
"Anyị na-anyụ onwe anyị ahụrụ, onweghị ihe na-eme."
"Ọ bụ onye na-anaghị agbakasị m ahụ chaachaa. Ọ na-akpa m ọchị nke ukwuu."
"Naanị otu ihe m na-enyere ya aka maka ya bụ na ọ na-ewe iwe ngwangwa."
"O wekwaanụ iwe, ọ ga-agwa gị ya ebe ahụ etu o si dịrị ya n'obi."
"Mana obere oge, o kporo ihe niile ahụ kpofuo, chịrịkwa ọchị gawa."
Stan Nze kwuru na ya ga-agbasi mbọ ike ịhụ na ya na nwunye ya alụghị ọgụ maọbụ see okwu n'ime afọ mbụ ha ji gbaa akwụkwọ.
"Ọtụtụ na-ekwu na ọnwa isii di na nwunye ji gbachaa akwụkwọ, ha ga-amalite ise okwu, mana ọ gaghị adịrị m otu ahụ," Nze kwuru.
Onye bụ Stan Nze?

- Stan Nze bụ onye na-eme ejije Nollywood a ma ama.
- Ezigbo aha ya bụ Stanley Ebuka Nzediegwu
- Ọ bụ onye Osumenyi n'Anambra steeti
- O meela ọtụtụ ejije gbara ọkpụrụkpụ nke gụnyere 'Rattle Snake - The return of Ahanna';
- Ọ chọburu ịbụ onye ọkwọ ụgbọelu, maọbụ Dibia bekee
- Mana o mechara gụọ kọmputa sayensị na mahadum
Onye bụ Blessing Obasi?

- Blessing Obasi bụkwa nwa ada a ma nke ọma n'ime ejije Nollywood
- Ọ bụkwa onye na-emepụta ejije emepụta, nke bekee na-akpọ 'producer'
- Ọ bụ onye Abia steeti
- Ọ gụrụ akwụkwọ kọleji na 'Government Girls College, Umuahia
- O nwetakwara nzere 'Bachelor's Degree' na Mahadum Legọs (Unilag)
ncG1vNJzZmivp6x7o67CZ5qopV%2BetKO7jpqdoqqZoK5ugZdyanBuYmk%3D